Isaiah 10

1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;
ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,
2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha
nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,
na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha
na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.
3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?
Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?
Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?
Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?
4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,
maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Ikpe ọmụma Chineke nke dịrị Asịrịa

5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.
Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma
Maọbụ, oke iwe
m dị.
6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,
ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,
nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,
nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya;
o zubere ịla ndị m nʼiyi,
na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
8Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?
Hamat ọ dịghị ka Apad;
Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,
alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị
dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ”
12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13Nʼihi na ọ na-asị,

“ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,
ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.
Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,
apụnara m ha akụ ha niile;
dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,
dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,
otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;
Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,
maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ”

15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?
Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,
maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;
ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya
dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,
Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi.
Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ
ogwu niile na uke niile ọkụ.
18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
nʼiyi kpamkpam,
dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.

Ndị ga-afọdụ nʼIzrel

20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,
na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb,
agaghịkwa adabere nʼonye
Nʼebe a na-ekwu banyere mba Asịrịa.
ahụ
tidara ha,
kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị,
Onye nsọ nke Izrel.
21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.
A kabiela ịla nʼiyi,
nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,

“Unu ndị m, ndị bi na Zayọn,
unu atụkwala ndị Asịrịa egwu
bụ ndị na-eti unu mkpara igwe,
na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.
25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,
ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”

26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe
dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb.
Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri,
ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.
27Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe
unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ.
Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi,
wezuga ibu arọ unu.

28Ha erutela Ayịat;
ugbu a, ha nọ na Migrọn.
Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.
29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara;
ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba!
Ndị Rema na-ama jijiji,
obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.
30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim,
geenụ ntị unu ndị Laisha!
Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!
31Lee na Madmena nọ nʼọsọ,
ndị Gebim na-ezo onwe ha.
32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa;
ha na-atụ ugwu Zayọn
na Jerusalem aka,
na-ekwere ya nʼisi.

33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile.
Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu,
meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.
34Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa.
Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.
Copyright information for IboBIU